Psalms 40

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Abụ ekele

1Eji m ndidi chere Onyenwe anyị,
ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.
2O sitere nʼolulu na-amị amị,
nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m;
o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume,
nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.
3O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m,
abụ otuto nye Chineke anyị.
Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu,
ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.

4Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ,
onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya;
onye na-adịghị ele ndị mpako anya
maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.
Maọbụ, gbasoo okwu ụgha

5O Onyenwe anyị Chineke m,
ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ,
ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile
ị kwadooro maka inye anyị;
a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha,
ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.

6Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ
ma ị megheela ntị abụọ;
aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.
7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m,
e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.
8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ,
iwu gị dị nʼime obi m.”

9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi;
dịka ị maara, o Onyenwe anyị,
anaghị m emechi ọnụ m.
10Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m,
ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị.
Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị,
nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.

11O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị,
ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.
12Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu;
mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ:
ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi,
obi m na-adakwa mba nʼime m.
13O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m;
O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.

14Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m,
bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara;
ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m,
laghachi azụ nʼihere.
15Ka ndị ahụ na-asị m,
“Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha.
16Ma ka ndị niile na-achọ gị
ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị;
ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile,
Onyenwe anyị dị ukwuu.”

17Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa;
ka Onyenwe anyị cheta m.
Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m;
Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa.
Copyright information for IboBIU